Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 92:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ bu ezi ihe ikele Jehova ekele,Na ibùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu:

2. Igosi ebere-Gi n'ututu,Igosi kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi kwa-abali,

3. Nēji ubọ nke akwara iri, nēji kwa une;Nēji higgaion n'elu ubọ-akwara.

4. N'ihi na I mewo ka m'ṅuria site n'ọlu-Gi, Jehova:Ọ bu n'ọlu nile nke aka-Gi ka m'gēti nkpu ọṅù.

5. Le ka ọlu-Gi nile si di uku, Jehova!Èchìchè-Gi miri emi nke-uku.

6. Madu nke bu anu-ọhia adighi-ama ama;Onye-nzuzu adighi-aghọta kwa nka:

7. Mb͕e ndi nēmebi iwu nāma akwukwọ dika ihe-ọkukú,Mb͕e ndi nile nke nalu ajọ ihe nāwa kwa okoko-osisi;Ọ bu ka ewe kpochapu ha rue mb͕e nile ebighi-ebi:

8. Ma Gi onwe-gi nọ n'ebe di elu rue mb͕e ebighi-ebi, Jehova.

9. N'ihi na, le, ndi-iro-Gi, Jehova,N'ihi na, le, ndi-iro-Gi gāla n'iyì;Ndi nile nke nālu ajọ ihe gēkesa onwe-ha.

10. Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu:Ejiwo manu ọhu wusam.

11. Anyam elekwasiwo kwa ndi nēchem anwu,Ihe bayere ndi nēbili imegidem, bú ndi nēme ihe ọjọ, ka ntim abua nānu.

12. Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu:Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.

13. Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisiGāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 92