Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 91:7-14 Bible Nso (IGBOB)

7. Nnù madu abua na ọgu iri gāda n'akuku-gi;Orú nnù madu na nnù ise gāda kwa n'aka-nri-gi;Ma ọ gaghi-abiaru gi nso.

8. Ọ bu nání na I gēji anya-gi abua legide,We hu nkwughachi nke ndi nēmebi iwu.

9. N'ihi na gi onwe-gi asiwo, Jehova bu ebe-nb͕abàm;N'ihi na ọ bu Onye kachasi ihe nile elu ka i meworo ebe-obibi-gi;

10. Ihe ọjọ agaghi-adakwasi gi,Ihe-otiti agaghi-abiaru kwa nso ulo-ikwū-gi.

11. N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi,Idebe gi n'uzọ-gi nile.

12. N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.

13. Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu:I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.

14. N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa:M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 91