11. N'ihi na ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi,Idebe gi n'uzọ-gi nile.
12. N'elu ọbu-aka-ha ka ha gēburu gi,Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume.
13. Ọbuná ọdum na aju-ala ka i gāzọkwasi ukwu:I gāzọb͕u nwa-ọdum na ogologo anu-miri.
14. N'ihi na ọ huwom n'anya si-ike, M'gēme kwa ka ọ b͕aputa:M'gēme ka ọ nọ n'ebe di elu, n'ihi na ọ mawo aham.
15. Ọ gākpọkum, M'gāza kwa ya;Mu onwem gānọyere ya n'ahuhu:M'gādọputa ya, sọpuru kwa ya.