Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 90:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye-nwe-ayi, ebe-obibi ka Gi onwe-gi buworo ayiN'ọb͕ọ nile.

2. Tutu amuputa ugwu,Ma-ọbu tutu I kpua uwa na elu-uwa dum madu bi,Ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi, Gi onwe-gi bu Chineke.

3. I nēme ka madu laghachi n'ájá;I we si, Laghachinu, umu madu.

4. N'ihi na nnù arọ abua na ọgu iri n'anya-GiDi ka nnyahuru mb͕e ọ nāga,Na dika otù nche n'abali.

5. I wuchapuwo ha dika oké miri-ozuzo; nání ura ka ha bu:N'ututu ha di ka ahihia nētó etó.

6. N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó;N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 90