Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 9:7-16 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi:O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.

8. Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume,Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi.

9. Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10. Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11. Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

12. N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.

13. Merem amara, Jehova;Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì,Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14. Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile:N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15. Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere:N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16. Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 9