40. I tiwawo ogige-ya nile;I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.
41. Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.
42. I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.
43. Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.
44. I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.
45. I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah
46. Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?
47. Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?
48. Òle nwoke ọ bu nke gādi ndu, ghara ihu ọnwu anya,Nke gēme ka nkpuru-obi-ya wepuga onwe-ya n'aka ala-mọ? Selah
49. Òle ebe ebere, mbu Gi nile di. Onye-nwe-ayi,Nke I ṅuru Devid iyi bayere ha n'ikwesi-ntukwasi-obi-Gi?
50. Onye-nwe-ayi, cheta ita-uta ndi-orù-Gi;Eburuwom n'obim ita-uta nke ndi nile di iche iche bara uba;
51. Nke ndi-iro-Gi jiworo ta uta, Jehova,Nke ha jiworo ta nzọ-ukwu nile nke onye-Gi etere manu uta.