Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 89:30-44 Bible Nso (IGBOB)

30. Ọ buru na umu-ya arapu iwum,Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;

31. Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;

32. M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.

33. Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.

34. M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.

35. Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;

36. Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.

37. Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah

38. Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.

39. I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.

40. I tiwawo ogige-ya nile;I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.

41. Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.

42. I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.

43. Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.

44. I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 89