Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 89:21-27 Bible Nso (IGBOB)

21. Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.

22. Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.

23. M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.

24. Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.

25. M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.

26. Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.

27. Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 89