Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 89:19-33 Bible Nso (IGBOB)

19. Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.

20. Achọtawom Devid, bú orùm;Ewerewom manu nsọm te ya:

21. Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.

22. Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.

23. M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.

24. Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.

25. M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.

26. Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.

27. Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.

28. Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.

29. M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.

30. Ọ buru na umu-ya arapu iwum,Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;

31. Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;

32. M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.

33. Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 89