17. N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.
18. N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi;Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.
19. Mb͕e ahu I gwara ndi-ebere-Gi okwu n'ọhù,Si, Atukwasiwom iye-aka n'aru dike;Emewom ka otù onye arọputaworo n'etiti ndim di elu.
20. Achọtawom Devid, bú orùm;Ewerewom manu nsọm te ya:
21. Onye akam gēguzosi ike n'ebe ọ nọ;Ọzọ, ogwe-akam gāb͕a ya ume.
22. Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede;Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.
23. M'gētipia kwa ndi nākpab͕u ya n'iru ya,Ti kwa ndi nākpọ ya asì ihe.
24. Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.
25. M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.