10. Gi onwe-gi azọpiawo Rehab, dika onye eb͕uru eb͕u;I werewo ogwe-aka nke ike-Gi chusa ndi-iro-Gi.
11. Gi nwe elu-igwe, Gi nwe kwa uwa:Elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya, Gi onwe-gi atọwo ntọ-ala-ha.
12. Ugwu na Ndida, Gi onwe-gi ekèwo ha:Teboa na Heamon nēti nkpu ọṅù n'aha-gi.
13. Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya:Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.
14. Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Gi:Ebere na ezi-okwu nāga n'iru Gi.
15. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu nke mara olu iti-nkpu ahu:Jehova, n'ìhè nke iru-Gi ka ha nēje ije.
16. N'aha-Gi ka ha nēteghari egwú ọṅù ogologo ubọchi nile:Ọ bu kwa n'ezi omume-Gi ka ha nādi elu.
17. N'ihi na ima-nma nke ike-ha ka I bu:Ọ bu kwa n'utọ ihe-ayi nātọ Gi ka mpi-ayi nādi elu.
18. N'ihi na Jehova nwe ọta-ayi;Ọ bu kwa Onye Nsọ nke Israel nwe eze-ayi.