Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 88:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, Chineke nke nzọputam,N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:

2. Kwe ka ekperem bata n'iru Gi;Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:

3. N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim,Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.

4. Aguwom na ndi nārida n'olùlù;Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:

5. Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya,Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì,Ndi I nēchetaghi ọzọ;Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.

6. I tọb͕ọwom n'olùlù dichasi ala,N'ebe di iche iche b͕ara ọchichiri, nime miri di omimi.

7. Ọnuma-Gi akwagidewom,I werewo kwa ebili-miri-Gi nile wedam n'ala. Selah

8. I mewo ka ndi m'mara nke-ọma nọm n'ebe di anya;I mewom ka m'ghọrọ ha ihe-árú:Abum onye eb͕ochiworo, adighm-apu kwa n'èzí.

9. Anyam adalawo n'isi site na nweda-n'ala:Jehova, akpọkuwom I kwa-ubọchi,Ab͕asawom ọbu-akam abua n'ebe I nọ.

10. Ọ̀ bu ndi nwuru anwu ka I gāluru oké ọlu?Ndi nādighi ndu, hà gēbili kele Gi? Selah

11. Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì?Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?

12. Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri?Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe?

13. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova,Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.

14. Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim?N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 88