Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 86:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi;Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.

10. N'ihi na onye uku ka I bu, I nālu kwa oké ọlu di iche iche:Gi onwe-gi bu Chineke, nání Gi.

11. Zim uzọ-Gi Jehova; m'gējeghari n'ezi-okwu-Gi:Me ka obim di n'otù itu egwu aha-Gi.

12. M'gēji obim nile kele Gi, Onye-nwe-ayi, Chineke;M'gāsọpuru kwa aha-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.

13. N'ihi na ebere-Gi di uku n'arum;I siwo n'ala-mọ nke dichasi ala naputa nkpuru-obim.

14. Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem,Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim,Ha edoghi kwa Gi n'iru ha.

15. Ma Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, bu Chineke Nke nwere obi-ebere, Onye di kwa amara,Nke nādighi-ewe iwe ọsọsọ, Nke nāba kwa uba n'ebere na ezi-okwu.

16. Chem iru, me-kwa-ram amaraNye orù-Gi ike-Gi,Zọputa kwa nwa-nwoke nke orù-Gi nwayi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 86