Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 83:8-16 Bible Nso (IGBOB)

8. Asiria araparawo kwa n'aru ha;Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah

9. Me ha otú I mere Midian;Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:

10. Ekpochapuru ha n'En-doa;Ha ghọro ǹsí eji mezi ala.

11. Me ndi-ha amara aha-ha ka ha di ka Oreb, na dika Zeeb;Me kwa ka ndi-isi-ha nile di ka Zeba na dika Zalmuna:

12. Ndi siri, Ka ayi nwetara onwe-ayiEbe-obibi nile nke Chineke.

13. Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu,Dika ahihia n'iru ifufe.

14. Dika ọku nke nēré oke ọhia,Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku;

15. Otú a were oké ifufe-Gi chua ha,Were kwa oké ikuku-Gi me ka ha ma jijiji.

16. Me ka nlelì che ha iru;Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 83