14. Dika ọku nke nēré oke ọhia,Na dika ire-ọku nke nēme ka ugwu nile nwuru ọku;
15. Otú a were oké ifufe-Gi chua ha,Were kwa oké ikuku-Gi me ka ha ma jijiji.
16. Me ka nlelì che ha iru;Ka ha we chọ aha-Gi, Jehova.
17. Ka ihere me ha, ka ha ma kwa jijiji rue mb͕e ebighi-ebi;E, ka ha nwe iru-ihere, la n'iyì: