Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 83:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, edebela ọnu-Gi du:Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke.

2. N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara:Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.

3. Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ,Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo.

4. Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe;Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.

5. N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù;Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:

6. Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael;Moab na ndi Haga;

7. Gebal, na Amon, na Amalek;Filistia, ya na ndi bi na Taia:

8. Asiria araparawo kwa n'aru ha;Ha aghọworo umu Lot ogwe aka. Selah

9. Me ha otú I mere Midian;Otú I mere Sisera, otú I mere Jebin nime miri-iyi Kaishon:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 83