1. Chineke, edebela ọnu-Gi du:Ab͕ala nkiti, anọ-kwa-la jū, Chineke.
2. N'ihi na, le, ndi-iro-Gi nāb͕a aghara:Ọzọ, ndi nākpọ Gi asì ebuliwo isi-ha.
3. Ọ bu imegide ndi-Gi ka ha nāb͕a ìzù aghughọ,Ha nāb͕a ìzù imegide ndi-Gi edebeworo na nzuzo.
4. Ha asiwo, Jenu, ka ayi zopu ha n'ibu mbe;Agaghi-echeta kwa aha Israel ọzọ.
5. N'ihi na ha ewerewo otù obi b͕arita ìzù;Ọ bu imegide Gi ka ha nāb͕a ndu:
6. Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael;Moab na ndi Haga;