Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 82:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke nēguzo Onwe-ya nime nzukọ Chineke;N'etiti chi nile ka Ọ nēkpe ikpe.

2. Rùe ole mb͕e ka unu gēkpe ikpe ajọ omume?Rù kwa ole mb͕e ka unu gāhu ndi nēmebi iwu iru-ọma?

3. Kpenu onye nēnweghi ike na nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi:Guanu onye ewedara n'ala na onye nọ na nkpà n'onye ezi omume.

4. Menu ka onye nēnweghi ike na ob͕eye b͕apu:Naputanu ha n'aka ndi nēmebi iwu.

5. Ha amaghi, ha aghọtaghi kwa;N'ọchichiri ka ha nējeghari:Ewezugawo ntọ-ala nile nke uwa n'ọnọdu-ha.

6. Mu onwem siri, Chi ka unu bu,Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 82