Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 78:63-69 Bible Nso (IGBOB)

63. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.

64. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.

65. Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.

66. O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.

67. Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;

68. Kama Ọ rọputara ebo Juda,Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.

69. O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu,Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 78