62. O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.
63. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.
64. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.
65. Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.
66. O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.
67. Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;
68. Kama Ọ rọputara ebo Juda,Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.
69. O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu,Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
70. Ọ rọputa-kwa-ara Devid, bú orù-Ya,O we si n'ogige ìgwè ewu na aturu kuru ya:
71. O mere ka o si n'iso nne-aturu nke nēnye umu-ha ara bia,Izù Jekob, bú ndi-Ya, na Israel, bú ihe-nketa-Ya, dika aturu.