58. Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe,Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.
59. Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè,Jusie Israel ike:
60. O we rapu ebe-obibi nke Shailo,Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;
61. O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha,Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.
62. O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.
63. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.
64. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.