Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 78:52-67 Bible Nso (IGBOB)

52. O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu,Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.

53. O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.

54. O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.

55. Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha,We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua,O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.

56. Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya,Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;

57. Kama ha laghachiri azu, we ghọb͕ue nghọb͕u dika ndi bu nna-ha:Ha riri mpe dika uta nāghọ aghughọ.

58. Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe,Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.

59. Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè,Jusie Israel ike:

60. O we rapu ebe-obibi nke Shailo,Bú ulo-ikwū nke O mere ka o biri n'etiti madu;

61. O we were ike-Ya nye ka adọta ya n'agha,Were kwa ima-nma-Ya nye n'aka onye-nkpab͕u.

62. O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.

63. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.

64. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.

65. Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.

66. O we tib͕ue ndi-nkpab͕u-Ya n'azu:Ita-uta ebighi-ebi ka O nyere ha.

67. Ọzọ, Ọ juru ulo-ikwū nke Josef,Ọ bughi kwa ebo Efraim ka Ọ rọputara;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 78