Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 78:39-56 Bible Nso (IGBOB)

39. O we cheta na anu-aru ka ha bu;Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.

40. Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara?Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?

41. Ha we chigharia, we nwa Chineke,Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.

42. Ha echetaghi aka-Ya,Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u.

43. Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt,Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan;

44. O we b͕anwe osimiri Nail nile ha ka ha ghọ ọbara,Ha adighi-aṅu kwa miri-ha nērù erù.

45. Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha;Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.

46. Ọ nye-kwa-ra ọbubu ihe-omume-ha,Nye kwa igurube ihe ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu inweta.

47. O nēji ákú-miri-ígwé b͕u osisi vine nile ha,Ji kwa frost b͕u osisi sycomore nile ha.

48. O mechibido-kwa-ra anumanu-ha nye ákú-miri-ígwé,Mechibido kwa anu-ulo nile ha nye àmùmà di ọku.

49. Ọ nēzite ọnuma nke iwe-Ya n'etiti ha,Nrubiga-ókè-iwe, na iwe, na nkpab͕u,Bú ozìzì nke ndi-mọ-ozi nke ihe ọjọ.

50. Ọ nēme ka uzọ di lari bayere iwe-Ya;O b͕ochighi nkpuru-obi-ha n'inwu ọnwu,Kama O mechibidoro ndu-ha nye ajọ ọria nēfe efe;

51. O we tib͕ue nwa ọ bula eburu uzọ mu n'Ijipt,Bú nkpuru mbu nke ume-ha n'ulo-ikwū nile nke Ham:

52. O we me ka ndi-Ya bulie ije dika ìgwè ewu na aturu,Ọ nēdu kwa ha n'ozara dika ìgwè aturu.

53. O we nēdu ha n'ikwesi-ntukwasi-obi, ha atughi kwa oké egwu:Ma ndi-iro-ha, oké osimiri kpuchiri ha.

54. O we me ka ha biarue ókè-ala nsọ Ya,Rue ugwu a nke aka-nri-Ya nwetara.

55. Ọ chupu-kwa-ra mba nile n'iru ha,We me ka ala ha barue ndi ya aka n'ala nketa e ji údò tua,O we me ka ebo nile nke Israel biri n'ulo-ikwū-ha.

56. Ma ha nwara Chineke Nke kachasi ihe nile elu, ha we nupu isi n'okpuru Ya,Ha edebeghi kwa ihe-àmà-Ya nile;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 78