36. Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
37. Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ,Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.
38. Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha:E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu,Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.
39. O we cheta na anu-aru ka ha bu;Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.