34. Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.
35. Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha,Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.
36. Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
37. Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ,Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.
38. Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha:E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu,Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.
39. O we cheta na anu-aru ka ha bu;Ifufe nke nālafe alafe, we ghara ilaghachi.
40. Ùb͕ò ole ka ha nānupu isi n'okpuru Ya n'ọzara?Ùb͕ò ole ka ha nēme ka o wuta Ya n'ala tọb͕ọrọ n'efu?
41. Ha we chigharia, we nwa Chineke,Ọ bu kwa Onye nsọ nke Israel ka ha kpasuru iwe.
42. Ha echetaghi aka-Ya,Ubọchi mb͕e Ọ b͕aputara ha n'aka onye-nkpab͕u.
43. Otú O tiyere ihe-iriba-ama-Ya nile n'Ijipt,Tiye kwa ihe-ebube-Ya nile n'ọhia Zoan;