25. Nri nke ndi di ike ka madu riri:O zitere ha ihe ha gēriju afọ.
26. O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe:O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.
27. O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:
28. O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,Buruburu ebe-obibi-ha nile.
29. Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
30. Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,
31. Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.
32. N'ihe a nile ha mehie-kwa-ara ọzọ,Ha ekweghi kwa n'oké ọlu-Ya nile.
33. O we me ka ubọchi nile ha gwusia n'otù nku-ume,O me-kwa-ra ka arọ nile ha gwusia n'obi-ọlulọ-miri.
34. Ọ buru na O b͕uru ha, ha we chọ Ya:Laghachi kwa, chọsie Chineke ike.
35. Ha we cheta na Chineke bu oké nkume-ha,Cheta kwa na Chineke Nke kachasi ihe nile elu bu Onye-nb͕aputa-ha.
36. Ha we ji ọnu-ha nārà Ya,Ji kwa ire-ha nāgwa Ya okwu-ugha.
37. Obi-ha eguzosighi kwa ike n'ebe Ọ nọ,Ha ekwesighi kwa ntukwasi-obi n'ọb͕ub͕a-ndu-Ya.