22. N'ihi na ha ekweghi na Chineke,Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.
23. O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu,Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;
24. O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie,Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.
25. Nri nke ndi di ike ka madu riri:O zitere ha ihe ha gēriju afọ.
26. O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe:O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.
27. O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:
28. O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,Buruburu ebe-obibi-ha nile.
29. Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.
30. Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,