Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 78:14-21 Bible Nso (IGBOB)

14. O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.

15. Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.

16. O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.

17. Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya,Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.

18. Ha we nwa Chineke n'obi-haN'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.

19. Ha we kwue okwu megide Chineke;Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?

20. Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù,Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè;Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye?Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?

21. N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè:Ewe kponwue ọku megide Jekob,Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 78