Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 78:13-31 Bible Nso (IGBOB)

13. O kewara oké osimiri, we me ka ha gabiga;O me-kwa-ra ka miri guzo ọtọ dika obo-ihe.

14. O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie,Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.

15. Ọ nākpọwa oké nkume di iche iche n'ọzara,We me ka ha ṅua miri ri nne dika o si nime ob͕u-miri puta.

16. O me-kwa-ra ka miri nke nērù erù si na nkume di elu puta,O we me ka miri nērùda dika ọtutu osimiri.

17. Ma ha nọ nēmehie kwa ọzọ imegide Ya,Inupu isi n'okpuru Onye kachasi ihe nile elu n'ala kpọro nku.

18. Ha we nwa Chineke n'obi-haN'iriọ ihe-oriri nye ọchichọ-nkpuru-obi-ha.

19. Ha we kwue okwu megide Chineke;Ha siri, Chineke, Ọ̀ puru ido table n'usoro n'ọzara?

20. Le, O tiri oké nkume ihe, miri we nērù erù,Isi-iyi di iche iche nērubiga kwa ókè;Ọ̀ di kwa achicha Ọ puru inye?Ọ̀ gēdoziri ndi-Ya anu?

21. N'ihi nke Jehova nuru, O we webiga iwe ókè:Ewe kponwue ọku megide Jekob,Ọzọ kwa, iwe kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide Israel;

22. N'ihi na ha ekweghi na Chineke,Ha atukwasighi kwa obi-ha na nzọputa-Ya.

23. O we nye mbara-ígwé nile n'elu iwu,Meghe kwa ọnu-uzọ nile nke elu-igwe;

24. O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie,Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.

25. Nri nke ndi di ike ka madu riri:O zitere ha ihe ha gēriju afọ.

26. O nēme ka ifufe Iru-anyanwu bulie ije n'elu-igwe:O ji-kwa-ra ike-Ya duru ifufe Ndida.

27. O we me ka anu zokwasi ha dika ájá,Ọbuná dika ájá oké osimiri, bú anu-ufe nwere nkù:

28. O we me ka ọ da n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-ha,Buruburu ebe-obibi-ha nile.

29. Ha we rie, afọ we ju ha nke-uku;Ọ bu kwa ihe ha nāchọsi ike ka Ọ nēme ka ọ biarue ha aru.

30. Ha abughi ndi ala ọzọ n'ebe ihe ha nāchọsi ike di,Ihe-oriri-ha nādi ha n'ọnu,

31. Mb͕e iwe Chineke kwugoro elu dika anwuru-ọku imegide ha,We b͕ue ufọdu n'etiti ndi-ha nke mara abuba,Ọ bu kwa umu-okorọbia nke Israel ka o mere ka ha ruru ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 78