Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 75:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ayi ekelewo Gi, Chineke;Ayi ekelewo ekele, aha-Gi di kwa nso:Ha akọwọ akukọ bayere oké ọlu-Gi nile.

2. Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà,Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi.

3. Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu:Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah

4. Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi:Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu:

5. Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu;Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.

6. N'ihi na ọ bughi n'Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n'Ọdida-anyanwu,Ọ bughi kwa n'ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia.

7. Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.

8. N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu;O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya:N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.

9. Ma mu onwem, m'gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi,M'gābùku Chineke nke Jekob abù ọma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 75