Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 74:4-20 Bible Nso (IGBOB)

4. Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi;Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,

5. Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-ukuN'alùghi-ulù nke osisi.

6. Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u,Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù.

7. Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku;Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ.

8. Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù:Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala.

9. Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi:Ọ dighi onye-amuma di ọzọ;Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.

10. Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta?Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi?

11. N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi?Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia.

12. Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie,Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa

13. Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri:I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.

14. Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi,I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.

15. Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.

16. Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.

17. Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.

18. Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta,Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.

19. Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi:Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi.

20. Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi:N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 74