Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 74:15-22 Bible Nso (IGBOB)

15. Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.

16. Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.

17. Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.

18. Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta,Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.

19. Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi:Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi.

20. Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi:N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike.

21. Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere:Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi.

22. Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n'ikpe:Cheta uta anāta Gi site n'ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 74