Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 73:11-27 Bible Nso (IGBOB)

11. Ha we si, Chìneke si aṅa mara?Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?

12. Le, ndia bu ndi nēmebi iwu;Ọzọ, ebe ha nānọgide n'udo mb͕e ebighi-ebi, ha emewo ka àkù-ha bùkari ibù.

13. Ọ bu nání n'efu ka m'meworo ka obim di ọcha,N'efu ka m'kwọworo ọbu-akam abua n'emeghi-ihe-ọjọ;

14. Buru kwa onye anēti ihe ogologo ubọchi nile,Onye iba-nbam di kwa-n'ututu.

15. Ọ buru na asiwom, M'gākọ akukọ otú a;Le, ọ bu ọb͕ọ nke umu-Gi ka m'gāghọb͕uwori.

16. M'we chè èchìchè imata nka,Ndọb͕u-onwem-n'ọlu ka ọ bu n'anyam;

17. Rue mb͕e m'nābà n'ebe nsọ nile nke Chineke,Ghọta ikpe-azu-ha.

18. N'ezie ọ bu n'ebe nile nālọ alọ ka I nēdo ha:I mewo ka ha darue ntikpọ.

19. Hà siri aṅa ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu n'otù ntabi-anya?Ha agwuwo gwusia site n'ihe-egwu di iche iche.

20. Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura;Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.

21. N'ihi na obim nāb͕ari uka,Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua.

22. Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe;Nání anu ka m'buworo n'iru Gi.

23. Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile:I jidewo aka-nrim.

24. I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum,Emesia I gēji kwa nsọpuru naram.

25. Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi?Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa.

26. Anu-arum na obim agwusiwo:Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.

27. N'ihi na, le, ndi nọ gi n'ebe di anya gāla n'iyì:I kpochapuwo onye ọ bula nke nāpu n'aka-Gi akwa iko.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 73