1. N'ezie Chineke di nma n'ebe Israel nọ,Bú n'ebe ndi di ọcha n'obi nọ.
2. Ma mu onwem, ọ fọduru nwantī ka ukwum abua wezuga onwe-ha;Nzọ-ukwum fọduru nke-ntà ka ha b͕uchapu.
3. N'ihi na ekwosorom ndi nānya isi ekworo,Ọ bu udo nke ndi nēmebi iwu ka m'nāhu.
4. N'ihi na ọ dighi nmekpa-aru ọ bula di n'ọnwu-ha:Ma aru-ha mara abuba.
5. Ha anọghi n'ahuhu madu ọzọ;Adighi-eti kwa ha ihe-otiti n'etiti madu nile.
6. N'ihi nka npako di ha buruburu dika iyab͕a-olu;Anēwere ime-ihe-ike kpuchie ha dika uwe.
7. Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa:Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.
8. Ha nākwa emò, nēkwu kwa okwu nmeb͕u n'ihe ọjọ:Ha nēsi n'ebe di elu kwu okwu.
9. Ha edowo ọnu-ha n'elu-igwe,Ire-ha nējeghari kwa n'uwa.
10. N'ihi nka ndi-Ya nālata n'ebe a,Ha nāmiputa-kwa-ra onwe-ha miri gēju afọ.
11. Ha we si, Chìneke si aṅa mara?Ọ̀ di kwa ọmuma-ihe di n'Onye kachasi ihe nile elu?