Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 7:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.

13. Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.

14. Le, ime ajọ ihe nēme ya;Ọ turuwo kwa ime nmeb͕u, muputa okwu-ugha.

15. Olùlù ka o gwuworo, gwuputa ya,O we da n'ebe-nbibi nke ọ nēme.

16. Nmeb͕u-ya gābiaghachi n'isi-ya,Ọ bu kwa n'opu-n'isi-ya ka ihe-ike-ya gāridakwasi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 7