Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 7:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova, bú Chinekem, na Gi ka m'b͕abàworo:Zọputam n'aka ndi nile nēsob͕um, naputakwam n'aka-ha:

2. Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.

3. Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;

4. Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ;(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)

5. Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;Ka ọ zọda kwa ndum n'ala,Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah

6. Bilie, Jehova, n'iwe-Gi,Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.

7. Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu:Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya.

8. Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

9. Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.

10. Ọtam dikwasi na Chineke,Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.

11. Chineke bu onye-ikpe nēme ezi omume,Ọ bu kwa Chineke nke nēwe iwe kwa-ubọchi.

12. Ọ buru na madu echigharighi, Ọ gāmu mma-agha-Ya ka ọ di nkọ;Ọ zọwo uta-Ya ukwu ikwe ya, dozie ya ib͕a.

13. Ọ bu kwa imegide ya ka O doziworo ihe nile nke ọnwu;Ọ nēme àkú-Ya ka ha buru ihe nēre ọku.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 7