10. Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke.
11. Onye-nwe-ayi nēnye okwu:Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.
12. Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga:Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha.
13. Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu,Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie,Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua.
14. Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,Snow nēzò na Zalmon.