Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 66:6-19 Bible Nso (IGBOB)

6. Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.

7. O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;Anya-Ya abua nēche mba nile nche:Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah

8. Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:

9. Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.

10. N'ihi na I nwawo ayi, Chineke:I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.

11. I mere ka ayi ma n'ọnyà;I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.

12. I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;Ayi bàra n'ọku na nime miri;I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.

13. M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi,M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,

14. Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.

15. Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi,Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu;M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah

16. Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke,M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.

17. Ya ka m'jiri ọnum kpọkue,Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem.

18. Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim,Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:

19. N'ezie Chineke anuwo olum;Ọ ṅawo nti olu ekerem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 66