Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 66:5-9 Bible Nso (IGBOB)

5. Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.

6. Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.

7. O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;Anya-Ya abua nēche mba nile nche:Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah

8. Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:

9. Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 66