Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 66:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:

2. Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma:Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.

3. Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu!N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.

4. Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi,Bùku kwa Gi abù ọma;Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah

5. Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.

6. Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 66