Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 66:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:

2. Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma:Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.

3. Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu!N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.

4. Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi,Bùku kwa Gi abù ọma;Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah

5. Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.

6. Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.

7. O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;Anya-Ya abua nēche mba nile nche:Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah

8. Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:

9. Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.

10. N'ihi na I nwawo ayi, Chineke:I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.

11. I mere ka ayi ma n'ọnyà;I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.

12. I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;Ayi bàra n'ọku na nime miri;I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 66