Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 64:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, nuru olum n'itughari-uchem:Nēchezi ndum ka ọ pua n'oké egwu nke onye-iro.

2. I gēzopum n'ìzù nzuzo nke ndi nēme ihe ọjọ:N'ìgwè ndi nālu ajọ ihe:

3. Ndi muworo ire-ha dika mma-agha,Ha edowo àkú-ha, bú okwu di ilu:

4. Ib͕a onye zuru okè àkú n'ebe nzuzo di iche iche:Na mberede ka ha nāb͕a ya, ha adighi-atu kwa egwu.

5. Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike;Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo;Ha siri, Ònye gāhu ha?

6. Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma:Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 64