8. Moab bu ite ọsisa-arum;N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:Filistia, tie nkpu n'ihim.
9. Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?Ònye duruworom rue Edom?
10. Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju?I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.
11. Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u:N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.