Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 60:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi,I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.

2. I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya:Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.

3. I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike:I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.

4. I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ,Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah

5. Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

6. Chineke ekwuwo okwu n'di-nsọ-Ya; ka m'ṅuria ọṅu-agha:M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

7. Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase;Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;Juda bu nkpa-n'aka-ezem.

8. Moab bu ite ọsisa-arum;N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:Filistia, tie nkpu n'ihim.

9. Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?Ònye duruworom rue Edom?

10. Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju?I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 60