9. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.
10. N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile:Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.
11. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya:Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.
12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;M'gānagide kwa ya:Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;M'gēzonari kwa ya onwem:
13. Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.
14. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
15. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.
16. Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku;Jehova gāzọputakwam.
17. Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude:Ọ gānu kwa olum.