Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 55:9-12 Bible Nso (IGBOB)

9. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.

10. N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile:Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.

11. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya:Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.

12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;M'gānagide kwa ya:Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;M'gēzonari kwa ya onwem:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 55