5. Egwu na ima-jijiji nābiarum aru,Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.
6. M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru!M'gēfela, we nọdu du.
7. Le, m'gēferu ebe di anya,Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah
8. M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufeBiarue ebe-nb͕apu dirim.
9. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.
10. N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile:Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.
11. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya:Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.
12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;M'gānagide kwa ya:Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;M'gēzonari kwa ya onwem:
13. Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.