Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 55:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;M'gānagide kwa ya:Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;M'gēzonari kwa ya onwem:

13. Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.

14. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.

15. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.

16. Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku;Jehova gāzọputakwam.

17. Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude:Ọ gānu kwa olum.

18. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso:N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 55