Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 55:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Ge nti n'ekperem, Chineke;Ezonari-kwa-la Onwe-gi n'aririọ-amaram.

2. Ṅam nti, zam:Anamalù ulù na ntughari-obim, nāsu kwa oké ude;

3. N'ihi olu onye-iro,N'ihi nkpab͕u nke onye nēmebi iwu;N'ihi na ha nēme ka ajọ ihe me nkpatu megidem,Ọ bu kwa n'iwe ka ha nākpọm asì.

4. O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem:Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.

5. Egwu na ima-jijiji nābiarum aru,Oké ọma-jijiji ekpuchiwokwam.

6. M'we si, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem nkù dika nduru!M'gēfela, we nọdu du.

7. Le, m'gēferu ebe di anya,Nọ ọnọdu-abali n'ọzara. Selah

8. M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufeBiarue ebe-nb͕apu dirim.

9. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 55