Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Abù Ọma 51:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di:Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.

2. Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem,Me kwa ka m'si na nmehiem di ọcha.

3. N'ihi na mu onwem mara njehiem nile:Nmehiem di kwa n'irum mb͕e nile.

4. Megide Gi, nání Gi, ka m'mehieworo,Ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n'anya-Gi ka m'meworo:Ka I we buru onye ezi omume mb͕e I nēkwu okwu,Di kwa ọcha n'obi mb͕e I nēkpe ikpe.

5. Le, n'ajọ omume ka amuputaram;Ọ bu kwa na nmehie ka nnem turu imem.

6. Le, ezi-okwu n'akuku nile di nime madu atọwo Gi utọ:Ọ bu kwa n'akuku zoro ezo ka i nēme ka m'mara amam-ihe.

7. I gēwere hyssop wepu nmehiem, m'gādi kwa ọcha:I gāsucham dika ákwà, m'gādi kwa ọcha kari snow.

8. I gēme ka m'nuru olu obi-utọ na ọṅù;Ka ọkpukpu nile I gwepiaworo we tegharia egwú-ọṅù.

9. Zopu iru-Gi na nmehiem nile,Hichapu kwa ajọ omumem nile.

10. Kèrem obi di ọcha, Chineke;Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Abù Ọma 51